Ndị Ikpe 1

Ha jekwuru ndị Kenan bi nʼobodo Hebrọn (nke a na-akpọ Kiriat Aaba na mbụ) merie Sheshai, na Ahiman, na Talmai.

Judges 1:10 (UKJV) And Judah went against the Canaanites that dwelt in Hebron: (now the name of Hebron before was Kirjatharba:) and they slew Sheshai, and Ahiman, and Talmai.

8Ndị Juda busoro obodo Jerusalem agha, were mma agha gbuchapụ mmadụ niile bi nʼime ya, ma gbaakwa obodo ahụ niile ọkụ.

9Mgbe nke a gasịrị, ndị agha Juda busoro ndị Kenan bi na ndịda ala ugwu ugwu ahụ, bụ Negev, ya na akụkụ ọdịda anyanwụ nʼebe dị ala ala.

10Ha jekwuru ndị Kenan bi nʼobodo Hebrọn (nke a na-akpọ Kiriat Aaba na mbụ) merie Sheshai, na Ahiman, na Talmai.

11Site nʼebe ahụ, ha jekwuru ndị bi na Debịa (nke a na-akpọ Kiriat Sefa, nʼoge mbụ).

12Kaleb sịrị, “Nwoke ọbụla ga-aga busoo Kiriat Sefa agha ma merie ya ka m ga-akpọnye Aksa bụ nwa m nwanyị ka ọ bụrụ nwunye ya.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.