Ndị Ikpe 1

Ma banyere ndị ebo Dan, ndị Amọrait chụpụrụ ha chụba ha nʼelu ugwu. Ha ekwenyeghị ka ha rịdata na ndịda ugwu ahụ.

Judges 1:34 (UKJV) And the Amorites forced the children of Dan into the mountain: for they would not suffer them to come down to the valley:

32Ndị Asha binyere nʼetiti ndị Kenan bụ ndị bi nʼala ahụ, nʼihi na ha achụpụghị ha.

33Ndị ebo Naftalị achụpụghịkwa ndị bi na Bet-Shemesh, maọbụ ndị bi na Bet-Anat. Kama ndị Naftalị binyere ndị Kenan bi nʼala ahụ. Ma ndị bi na Bet-Shemesh, na Bet-Anat ghọrọ ndị ohu ndị Naftalị.

34Ma banyere ndị ebo Dan, ndị Amọrait chụpụrụ ha chụba ha nʼelu ugwu. Ha ekwenyeghị ka ha rịdata na ndịda ugwu ahụ.

35Ma ndị Amọrait nọgidesịrị ike nʼugwu Heres, na Aijalon, na Shaalbim, ma mgbe ike ebo Josef bara ụba, ha meriri ha, mee ha ndị ohu ha.

36Oke ala ụmụ ndị Amọrait malitere na mgbago Akrabim ruo, ma gafeekwa ebe a na-akpọ Sela.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.