34Ma banyere ndị ebo Dan, ndị Amọrait chụpụrụ ha chụba ha nʼelu ugwu. Ha ekwenyeghị ka ha rịdata na ndịda ugwu ahụ.
35Ma ndị Amọrait nọgidesịrị ike nʼugwu Heres, na Aijalon, na Shaalbim, ma mgbe ike ebo Josef bara ụba, ha meriri ha, mee ha ndị ohu ha.
36Oke ala ụmụ ndị Amọrait malitere na mgbago Akrabim ruo, ma gafeekwa ebe a na-akpọ Sela.