Ndị Ikpe 1

Mgbe Juda busoro ha agha, Onyenwe anyị nyefere ndị Kenan, na ndị Periz nʼaka ha, mee ka ha gbuo puku ndị agha iri nʼime obodo Bezek.

Judges 1:4 (UKJV) And Judah went up; and the LORD delivered the Canaanites and the Perizzites into their hand: and they slew of them in Bezek ten thousand men.

2Onyenwe anyị zara, “Ọ bụ ebo Juda. Enyefeela m ala ahụ nʼaka ha.”

3Ndị Juda gwara ụmụ nwanne ha ndị ebo Simiọn sị, “Soronụ anyị banye nʼala ahụ anyị ketara site nʼife nza, ka anyị ga lụso ndị Kenan agha. Anyị ga-esokwara unu banye nʼala nke unu.” Ya mere, ndị ebo Simiọn soro ha gaa.

4Mgbe Juda busoro ha agha, Onyenwe anyị nyefere ndị Kenan, na ndị Periz nʼaka ha, mee ka ha gbuo puku ndị agha iri nʼime obodo Bezek.

5Nʼebe ahụ ka ha zutere Adoni-Bezek, buso ya agha, tigbukwaa ndị Kenan na ndị Periz.

6Ma Adoni-Bezek gbapụrụ ọsọ zoo onwe ya, ma ha chụgidere ya, jide ya, gbupụ ya isi mkpụrụ aka ya abụọ na isi mkpụrụ ụkwụ ya abụọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.