4O nwere ụmụ ndị ikom iri atọ, ndị na-agba ịnyịnya ibu iri atọ. Ha nwekwara obodo iri atọ nke aka ha na Gilead, nke a na-akpọkwa Havọt Jaịa ruo taa.
5Ma mgbe Jaịa nwụrụ, e liri ya na Kamon.
6Ọzọkwa, ụmụ Izrel mere ihe jọrọ njọ nʼihu Onyenwe anyị, ha fere chi Baal na Ashtọret, chi ndị Aram, chi ndị Saịdọn, nke ndị Moab, nke ndị Amọn, na chi ndị Filistia ofufe. Ndị Izrel hapụrụ Onyenwe anyị, ha efekwaghị ya ofufe.
7Nke a mere ka Onyenwe anyị wee iwe megide ha. O nyefere ha nʼaka ndị Filistia na ndị Amọn,
8ndị mekpara ha ahụ, chie ha ọnụ nʼala. Afọ iri na asatọ ka ndị Filistia megburu ndị Izrel bi nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan, nʼime ala ndị Amọrait, ya bụ na Gilead.