10Ndị okenye Gilead zara, “Onyenwe anyị bụ onye akaebe, na anyị aghaghị ime dịka i kwuru.”
11Ya mere, Jefta sooro ndị okenye Gilead, ha mekwara ya onyeisi ha na ọchịagha ha. O kwughachikwara okwu ya niile nʼihu Onyenwe anyị nʼobodo Mizpa.
12Mgbe ahụ, Jefta zipụrụ ndị ozi ka ha jekwuru eze ndị Amọn jụọ ya ajụjụ sị, “Gịnị bụ ihe i nwere megide anyị i ji ebuso ala anyị agha?”
13Eze ndị Amọn zaghachiri ndị ozi Jefta, “Mgbe ụmụ Izrel si nʼala Ijipt pụta, ha ji aka ike napụ anyị ala anyị, site nʼosimiri Anọn ruo na Jabọk, rukwaa nʼosimiri Jọdan. Ugbu a nyeghachinụ anyị ala ahụ niile nʼudo.”
14Jefta zighachiri ndị ozi ka ha jekwuru eze ndị Amọn,