12Mgbe ahụ, Jefta zipụrụ ndị ozi ka ha jekwuru eze ndị Amọn jụọ ya ajụjụ sị, “Gịnị bụ ihe i nwere megide anyị i ji ebuso ala anyị agha?”
13Eze ndị Amọn zaghachiri ndị ozi Jefta, “Mgbe ụmụ Izrel si nʼala Ijipt pụta, ha ji aka ike napụ anyị ala anyị, site nʼosimiri Anọn ruo na Jabọk, rukwaa nʼosimiri Jọdan. Ugbu a nyeghachinụ anyị ala ahụ niile nʼudo.”
14Jefta zighachiri ndị ozi ka ha jekwuru eze ndị Amọn,
15na-asị, “Ihe ndị a ka Jefta sịrị: Izrel esiteghị nʼaka ike napụ Moab maọbụ Amọn ala ha.
16Kama, mgbe ha si Ijipt rigopụta, Izrel sitere nʼọzara bịaruo Osimiri Uhie, sikwa nʼebe ahụ ruo Kadesh.