13Eze ndị Amọn zaghachiri ndị ozi Jefta, “Mgbe ụmụ Izrel si nʼala Ijipt pụta, ha ji aka ike napụ anyị ala anyị, site nʼosimiri Anọn ruo na Jabọk, rukwaa nʼosimiri Jọdan. Ugbu a nyeghachinụ anyị ala ahụ niile nʼudo.”
14Jefta zighachiri ndị ozi ka ha jekwuru eze ndị Amọn,
15na-asị, “Ihe ndị a ka Jefta sịrị: Izrel esiteghị nʼaka ike napụ Moab maọbụ Amọn ala ha.
16Kama, mgbe ha si Ijipt rigopụta, Izrel sitere nʼọzara bịaruo Osimiri Uhie, sikwa nʼebe ahụ ruo Kadesh.
17Mgbe ahụ, Izrel zipụrụ ndị ozi ka ha jekwuru eze Edọm sị ya, ‘Kwere ka anyị si nʼala gị gafere,’ ma eze Edọm jụrụ ajụ. Ha zipụkwara ozi nye eze Moab, ma o kwenyeghị. Nʼihi ya, Izrel nọgidere na Kadesh.