21“Mgbe ahụ, Onyenwe anyị, Chineke Izrel nyere Saịhọn na ndị agha ya niile nʼaka Izrel. Ha merikwara ha. Izrel nwetara ala niile nke ndị Amọrait, bụ ndị bi nʼala ahụ.
22Ha nwetara ala niile ahụ, site nʼAnọn ruo Jabọk, sitekwa nʼọzara ruo Jọdan.
23“Ma ugbu a, Onyenwe anyị, Chineke Izrel achụpụla ndị Amọrait nʼihu ndị ya bụ Izrel. Olee ikike i nwere iwere ala ahụ?
24Ọ bụghị ihe chi gị, Kemosh, nyere gị ka i ga-enweta? Otu aka ahụ kwa, ihe ọbụla Onyenwe anyị Chineke anyị nyere anyị ka anyị ga-enweta.
25Ị dị mma karịa Balak nwa Zipoa, eze Moab? O nwere mgbe ọ chọrọ Izrel okwu, maọbụ lụso ha agha?