19“Mgbe ahụ, ụmụ Izrel zigara ndị ozi ka ha jekwuru Saịhọn eze ndị Amọrait, onye bi na Heshbọn, sị ya, ‘Biko, ka anyị site nʼala gị gafee ruo nʼala nke anyị.’
20Ma eze Saịhọn atụkwasịghị Izrel obi isite nʼoke ala ya gabiga. Nʼihi nke a, ọ chịkọtara usuu ndị agha ya, ma ụlọ ikwu na Jahaz, buso ụmụ Izrel agha.
21“Mgbe ahụ, Onyenwe anyị, Chineke Izrel nyere Saịhọn na ndị agha ya niile nʼaka Izrel. Ha merikwara ha. Izrel nwetara ala niile nke ndị Amọrait, bụ ndị bi nʼala ahụ.
22Ha nwetara ala niile ahụ, site nʼAnọn ruo Jabọk, sitekwa nʼọzara ruo Jọdan.
23“Ma ugbu a, Onyenwe anyị, Chineke Izrel achụpụla ndị Amọrait nʼihu ndị ya bụ Izrel. Olee ikike i nwere iwere ala ahụ?