Ndị Ikpe 11

Ma eze Amọn egeghị ntị nʼozi Jefta ziri ka e zie ya.

Judges 11:28 (UKJV) Nevertheless the king of the children of Ammon hearkened not unto the words of Jephthah which he sent him.

26Ọ bụ narị afọ atọ kemgbe ụmụ Izrel malitere ibi na Heshbọn na Aroea, na nʼime obodo ndị ọzọ gbara ha gburugburu ruo nʼiyi Anọn. Ọ bụkwa gịnị mere na ịnapụtaghị ala ndị a nʼoge ndị ahụ?

27Emegideghị m gị, kama ọ bụ gị na-emejọ m, site nʼibuso m agha. Ka Onyenwe anyị, onye na-ekpe ikpe ziri ezi kpebie ikpe a taa nʼetiti ndị Izrel na ndị Amọn.”

28Ma eze Amọn egeghị ntị nʼozi Jefta ziri ka e zie ya.

29Nʼoge ahụ, mmụọ Onyenwe anyị dakwasịrị Jefta. Site nʼike mmụọ ahụ, o duuru ndị agha Izrel gafee obodo Gilead na Manase, gafeekwa Mizpa, nke dị nʼime Gilead, gaa lụso ndị Amọn agha.

30Jefta kwere Onyenwe anyị nkwa sị ya, “Ọ bụrụ na ị ga-enyefe ndị Amọn nʼaka m,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.