28Ma eze Amọn egeghị ntị nʼozi Jefta ziri ka e zie ya.
29Nʼoge ahụ, mmụọ Onyenwe anyị dakwasịrị Jefta. Site nʼike mmụọ ahụ, o duuru ndị agha Izrel gafee obodo Gilead na Manase, gafeekwa Mizpa, nke dị nʼime Gilead, gaa lụso ndị Amọn agha.
30Jefta kwere Onyenwe anyị nkwa sị ya, “Ọ bụrụ na ị ga-enyefe ndị Amọn nʼaka m,
31ihe ọbụla sitere nʼọnụ ụzọ ụlọ m pụta izute m mgbe m lọghachiri nʼọnọdụ mmeri megide ndị Amọn, ga-abụ nke Onyenwe anyị. Aga m eji ya chụọ aja nsure ọkụ.”
32Jefta duuru ndị agha ya gaa ibuso Amọn agha. Onyenwe anyị nyekwara ya mmeri dị ukwuu.