Ndị Ikpe 11

Jefta duuru ndị agha ya gaa ibuso Amọn agha. Onyenwe anyị nyekwara ya mmeri dị ukwuu.

Judges 11:32 (UKJV) So Jephthah passed over unto the children of Ammon to fight against them; and the LORD delivered them into his hands.

30Jefta kwere Onyenwe anyị nkwa sị ya, “Ọ bụrụ na ị ga-enyefe ndị Amọn nʼaka m,

31ihe ọbụla sitere nʼọnụ ụzọ ụlọ m pụta izute m mgbe m lọghachiri nʼọnọdụ mmeri megide ndị Amọn, ga-abụ nke Onyenwe anyị. Aga m eji ya chụọ aja nsure ọkụ.”

32Jefta duuru ndị agha ya gaa ibuso Amọn agha. Onyenwe anyị nyekwara ya mmeri dị ukwuu.

33O bibiri iri obodo abụọ site nʼAroea ruo nso nso Minit, ruokwa Ebel-Keramim. Otu a ka Izrel si merie ndị Amọn.

34Mgbe Jefta lọghachiri nʼụlọ ya na Mizpa, ma lee ada ya nwanyị onye ji iti egwu na ite egwu pụta izute ya. Ọ bụ naanị ya ka nna ya mụtara. Ewezuga ya, nna ya amụtaghị nwa nwoke maọbụ nwa nwanyị ọzọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.