4O ruo mgbe ọtụtụ oge gasịrị, ndị Amọn busoro ụmụ Izrel agha.
5Ndị okenye Gilead jere ịkpọpụta Jefta site nʼala Tob.
6Ha sịrị ya, “Bịa buru onyeisi agha anyị ka anyị nwee ike ibuso ndị Amọn agha.”
7Jefta sịrị ha, “Unu akpọghị m asị, ma chụpụkwa m site nʼụlọ nna m? Gịnị mere unu ji na-achọ m ugbu a unu nọ nʼoke nsogbu?”
8Ndị okenye Gilead sịrị ya, “na-agbanyeghị nke a, anyị abịaghachikwutela gị ugbu a, bịa ka anyị na gị lụso ndị Amọn agha. Ị ga-abụkwa onyeisi anyị niile bi na Gilead.”