5Ndị okenye Gilead jere ịkpọpụta Jefta site nʼala Tob.
6Ha sịrị ya, “Bịa buru onyeisi agha anyị ka anyị nwee ike ibuso ndị Amọn agha.”
7Jefta sịrị ha, “Unu akpọghị m asị, ma chụpụkwa m site nʼụlọ nna m? Gịnị mere unu ji na-achọ m ugbu a unu nọ nʼoke nsogbu?”
8Ndị okenye Gilead sịrị ya, “na-agbanyeghị nke a, anyị abịaghachikwutela gị ugbu a, bịa ka anyị na gị lụso ndị Amọn agha. Ị ga-abụkwa onyeisi anyị niile bi na Gilead.”
9Jefta zara, “A sịkwarị na m esoro unu gaa lụso ndị Amọn agha, ọ bụrụ na Onyenwe anyị enyefee ha nʼaka m, m ga-abụ onyeisi unu nʼezie?”