5Ọ nọchiri akụkụ Jọdan dị ndị agha Ifrem nʼazụ, ebe ndị agha Ifrem nwere ike isi gbapụ. Mgbe ọbụla onye agha Ifrem ọbụla gbapụrụ ọsọ chọọ ịgafe osimiri ahụ, ndị agha Gilead ga-ejide ya jụọ ya sị, “Ị bụ onye Ifrem?” Ọ bụrụ na onye ahụ ekwuo na ya abụghị onye Ifrem,
6ha sịrị, “Ọ dị mma, kpọọ, ‘Shibolet.’ ” Ọ bụrụ na onye ahụ akpọ, “Sibolet,” nʼihi na ọ kpọpụtaghị mkpụrụ okwu ahụ nke ọma, ha na-akpụrụ ya gbuo ya na ngabiga mmiri Jọdan. Ọ bụ ọnụọgụgụ iri puku anọ, na puku abụọ ndị Ifrem ka e gburu mgbe ahụ.
7Jefta duuru ndị Izrel afọ isii. Mgbe ọ nwụrụ, e liri ya nʼotu obodo Gilead.
8Onye ikpe ọzọ Izrel nwere bụ Ibzan onye bi na Betlehem.
9O nwere iri ụmụ ndị ikom atọ na iri ụmụ ndị inyom atọ. O kenyere ndị ikom ikwu ọzọ ụmụ ya ndị inyom. Otu a kwa, o sikwa nʼikwu ọzọ lụtara ụmụ ya ndị ikom iri ndị inyom atọ. O kpere Izrel ikpe afọ asaa.