7Jefta duuru ndị Izrel afọ isii. Mgbe ọ nwụrụ, e liri ya nʼotu obodo Gilead.
8Onye ikpe ọzọ Izrel nwere bụ Ibzan onye bi na Betlehem.
9O nwere iri ụmụ ndị ikom atọ na iri ụmụ ndị inyom atọ. O kenyere ndị ikom ikwu ọzọ ụmụ ya ndị inyom. Otu a kwa, o sikwa nʼikwu ọzọ lụtara ụmụ ya ndị ikom iri ndị inyom atọ. O kpere Izrel ikpe afọ asaa.
10Ibzan nwụrụ, e lie ya na Betlehem.
11Onye ọzọ kpere Izrel ikpe bụ Elọn, onye Zebụlọn. O kpere Izrel ikpe afọ iri.