12Manoa gwara ya okwu sị, “Mgbe okwu gị mezuru, gịnị bụ iwu banyere ndụ na ọrụ nwa nwoke a?”
13Mmụọ ozi Onyenwe anyị zaghachiri, “Nwunye gị aghaghị imezu ihe niile m nke m gwara ya.
14Ka ọ ghara iri ihe ọbụla si nʼosisi vaịnị, maọbụ ṅụọ mmanya ọbụla maọbụ ihe ọbụla na-aba nʼanya, maọbụ rie ihe rụrụ arụ ọbụla.”
15Manoa rịọrọ Mmụọ ozi Onyenwe anyị si ya, “Ọ ga-amasị anyị ma ị nọdụ chere ka anyị kwadoro gị nwa ewu.”
16Ma Mmụọ ozi Onyenwe anyị zara ya, “A sịkwarị na i mee ka m nọrọ, agaghị m eri nri gị ọbụla. Ma ọ bụrụ na i kwadoo aja nsure ọkụ, were ya chụọrọ Onyenwe anyị aja.” Ma Manoa aghọtaghị na onye ahụ bụ Mmụọ ozi Onyenwe anyị.