2Mgbe ọ lọtara nʼụlọ, ọ gwara nne na nna ya, “Ahụrụ m otu nwanyị nʼime Timna sitere nʼụmụ ndị inyom Filistia; ugbu a, lụtara m ya na nwunye.”
3Nne na nna ya zara ya, “Ọ bụ na ọ dịghị nwanyị dị nʼetiti ndị inyom ụmụnne gị, maọbụ nʼetiti ndị anyị niile? Gịnị mere o ji bụrụ nʼetiti ndị Filistia a na-ebighị ugwu ka i si lụtara onwe gị nwunye?” Ma Samsin sịrị nna ya, “Gaa lụtara m ya. Nʼihi na o ziri ezi nʼanya m.”
4(Nne na nna ya aghọtaghị na aka Onyenwe anyị dị nʼọlụlụ nwunye a Samsin chọrọ ịlụ. Nʼihi na Onyenwe anyị na-achọ ụzọ ọ ga-esi megide ndị Filistia, ndị na-achị ụmụ Izrel nʼoge ahụ.)
5Samsin na nne na nna ya gawara obodo Timna maka ọlụlụ nwanyị a. Mgbe ha na-erute ubi vaịnị dị obodo Timna nso, otu nwa ọdụm sitere nʼọhịa mapụta, gbọrọ ụja na-abịakwute Samsin.
6Nʼotu oge ahụ, Mmụọ Onyenwe anyị bịakwasịrị Samsin nʼike. O jekwuuru ọdụm ahụ, were aka ya abụọ dọwaa ya ọnụ, dịka a ga-asị na ọ bụ nwa ewu. Ma Samsin agwaghị nne na nna ya ihe mere.