Ndị Ikpe 14

Ọ kọpụtara mmanụ aṅụ ahụ tinye nʼaka ya, malite ịracha ka ọ na-aga nʼụzọ. Mgbe ọ bịakwutere nne na nna ya, o nyebinyere ha ụfọdụ, ha onwe ha rachakwara ya. Ma ọ gwaghị ha na o wetara ya site nʼozu ọdụm.

Judges 14:9 (UKJV) And he took thereof in his hands, and went on eating, and came to his father and mother, and he gave them, and they did eat: but he told not them that he had taken the honey out of the carcass of the lion.

7Ma mgbe ha bịaruru Timna, Samsin na nwaagbọghọ ahụ kparịtara ụka. Ihe banyere nwaagbọghọ ahụ dị Samsin ezi mma.

8Ọ laghachiri mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị ka ọ kpọrọ ya. Ma mgbe ọ tụgharịrị ka ọ hụ ozu ọdụm ahụ, ọ hụrụ na igwe aṅụ bizi nʼime ozu ọdụm ahụ, na-emepụtakwa mmanụ aṅụ.

9Ọ kọpụtara mmanụ aṅụ ahụ tinye nʼaka ya, malite ịracha ka ọ na-aga nʼụzọ. Mgbe ọ bịakwutere nne na nna ya, o nyebinyere ha ụfọdụ, ha onwe ha rachakwara ya. Ma ọ gwaghị ha na o wetara ya site nʼozu ọdụm.

10Nna ya gara ịhụ nwanyị ahụ ma Samsin kpọkọtara ụmụ okorobịa obodo ahụ meere ha oriri dịka omenaala ha sị di.

11Mgbe Samsin rutere, a kpọnyere ya ndị bịara mmemme ọnụọgụgụ ha dị iri atọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.