Ndị Ikpe 14

Mgbe Samsin rutere, a kpọnyere ya ndị bịara mmemme ọnụọgụgụ ha dị iri atọ.

Judges 14:11 (UKJV) And it came to pass, when they saw him, that they brought thirty companions to be with him.

9Ọ kọpụtara mmanụ aṅụ ahụ tinye nʼaka ya, malite ịracha ka ọ na-aga nʼụzọ. Mgbe ọ bịakwutere nne na nna ya, o nyebinyere ha ụfọdụ, ha onwe ha rachakwara ya. Ma ọ gwaghị ha na o wetara ya site nʼozu ọdụm.

10Nna ya gara ịhụ nwanyị ahụ ma Samsin kpọkọtara ụmụ okorobịa obodo ahụ meere ha oriri dịka omenaala ha sị di.

11Mgbe Samsin rutere, a kpọnyere ya ndị bịara mmemme ọnụọgụgụ ha dị iri atọ.

12Mgbe ahụ, Samsin gwara ha okwu sị ha, “O nwere ajụjụ, gwa m, gwa m, gwa m, m chọrọ ka unu kọwaara m. Ọ bụrụ na unu enwee ike kọwaa ya, site taa ruo nʼụbọchị asaa nke mmemme a, aga m enye unu iri uwe mwụda atọ, nyekwa unu iri uwe mwụda atọ ọzọ akpara akpa.

13Ọ bụrụkwanụ na unu enweghị ike kọwaa ya, unu ga-enye m iri uwe mwụda atọ, na iri uwe mwụda atọ akpara akpa.” Ha niile kwenyere sị, “Ọ dị mma. Kwuo ka anyị nụ.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.