Ndị Ikpe 14

Mgbe ahụ, Samsin gwara ha okwu sị ha, “O nwere ajụjụ, gwa m, gwa m, gwa m, m chọrọ ka unu kọwaara m. Ọ bụrụ na unu enwee ike kọwaa ya, site taa ruo nʼụbọchị asaa nke mmemme a, aga m enye unu iri uwe mwụda atọ, nyekwa unu iri uwe mwụda atọ ọzọ akpara akpa.

Judges 14:12 (UKJV) And Samson said unto them, I will now put forth a riddle unto you: if all of you can certainly declare it me within the seven days of the feast, and find it out, then I will give you thirty sheets and thirty change of garments:

10Nna ya gara ịhụ nwanyị ahụ ma Samsin kpọkọtara ụmụ okorobịa obodo ahụ meere ha oriri dịka omenaala ha sị di.

11Mgbe Samsin rutere, a kpọnyere ya ndị bịara mmemme ọnụọgụgụ ha dị iri atọ.

12Mgbe ahụ, Samsin gwara ha okwu sị ha, “O nwere ajụjụ, gwa m, gwa m, gwa m, m chọrọ ka unu kọwaara m. Ọ bụrụ na unu enwee ike kọwaa ya, site taa ruo nʼụbọchị asaa nke mmemme a, aga m enye unu iri uwe mwụda atọ, nyekwa unu iri uwe mwụda atọ ọzọ akpara akpa.

13Ọ bụrụkwanụ na unu enweghị ike kọwaa ya, unu ga-enye m iri uwe mwụda atọ, na iri uwe mwụda atọ akpara akpa.” Ha niile kwenyere sị, “Ọ dị mma. Kwuo ka anyị nụ.”

14Ọ gwara ha sị, “Ihe oriri si nʼime onye na-eri eri na-apụta, ọzọkwa, ihe dị ụtọ si nʼime onye dị ike pụta.” Mgbe ụbọchị atọ gasịrị, ha enwebeghịkwa ike kọwaa ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.