Ndị Ikpe 16

Mgbe Delaịla matara na ọ gwala ya ihe niile, o ziri ozi kpọọ ndịisi ndị Filistia ahụ, sị, “Bịaghachinụ otu ugbu a, nʼihi na ọ gwara m ihe niile.” Ya mere, ndịisi ndị Filistia lọghachiri jiri ego ọlaedo ahụ nʼaka ha.

Judges 16:18 (UKJV) And when Delilah saw that he had told her all his heart, she sent and called for the lords of the Philistines, saying, Come up this once, for he has showed me all his heart. Then the lords of the Philistines came up unto her, and brought money in their hand.

16Delaịla sikwara otu a nyegide Samsin nsogbu tutu ruo mgbe Samsin na-enweghịkwa ike ịnagide nsogbu ya.

17Ya mere, ọ gwara ya ihe niile, “Ọ dịbeghị mgbe agụba ọbụla gara nʼelu isi m, nʼihi na abụ m onye Nazirait, onye e doro nsọ nye Chineke ka m bụ, site nʼafọ nne m. Ọ bụrụkwa na a kpụchapụ agịrị isi m, mgbe ahụ, ike niile dị m nʼahụ ga-apụ. Mgbe ahụ, aga m adịkwa ka ndị ọzọ.”

18Mgbe Delaịla matara na ọ gwala ya ihe niile, o ziri ozi kpọọ ndịisi ndị Filistia ahụ, sị, “Bịaghachinụ otu ugbu a, nʼihi na ọ gwara m ihe niile.” Ya mere, ndịisi ndị Filistia lọghachiri jiri ego ọlaedo ahụ nʼaka ha.

19Ma Delaịla mere ka o dinaa nʼapata ụkwụ ya rahụ ụra. Mgbe ahụ, ọ kpọbatara nwoke na-akpụcha isi, ka ọ kpụchapụ agịrị isi niile dị Samsin nʼisi, si otu a mee ka ike ghara ịdịkwa ya. Ike ya hapụrụ ya.

20O tiri mkpu sị, “Samsin, lee, ndị Filistia abịala ijide gị.” Ma mgbe Samsin bilitere site nʼụra, o chere nʼobi ya, “Aga m apụ ka m si mee na mbụ megharịa arụ ma nwere onwe m.” Ma ọ maghị na Onyenwe anyị ahapụla ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.