19Ma Delaịla mere ka o dinaa nʼapata ụkwụ ya rahụ ụra. Mgbe ahụ, ọ kpọbatara nwoke na-akpụcha isi, ka ọ kpụchapụ agịrị isi niile dị Samsin nʼisi, si otu a mee ka ike ghara ịdịkwa ya. Ike ya hapụrụ ya.
20O tiri mkpu sị, “Samsin, lee, ndị Filistia abịala ijide gị.” Ma mgbe Samsin bilitere site nʼụra, o chere nʼobi ya, “Aga m apụ ka m si mee na mbụ megharịa arụ ma nwere onwe m.” Ma ọ maghị na Onyenwe anyị ahapụla ya.
21Ndị Filistia jidere ya, ghụpụ ya anya ya abụọ, duru ya gbadata Gaza. Nʼebe ahụ, ha jiri ụdọ bronz kee ya agbụ, nye ya ọrụ ịnyagharị igwe na-akwọ ọka nʼụlọ mkpọrọ ha tinyere ya.
22Mgbe na-adịghị anya, agịrị isi ya malitekwara ito ọzọ.
23Ugbu a, ndịisi ndị Filistia niile zukọtara ịchụrụ chi ha bụ Dagọn, aja dị ukwuu, na ịṅụrị ọṅụ, na-asị, “Chi anyị enyela Samsin bụ onye iro anyị nʼaka anyị.”