Ndị Ikpe 16

Mgbe na-adịghị anya, agịrị isi ya malitekwara ito ọzọ.

Judges 16:22 (UKJV) Nevertheless the hair of his head began to grow again after he was shaven.

20O tiri mkpu sị, “Samsin, lee, ndị Filistia abịala ijide gị.” Ma mgbe Samsin bilitere site nʼụra, o chere nʼobi ya, “Aga m apụ ka m si mee na mbụ megharịa arụ ma nwere onwe m.” Ma ọ maghị na Onyenwe anyị ahapụla ya.

21Ndị Filistia jidere ya, ghụpụ ya anya ya abụọ, duru ya gbadata Gaza. Nʼebe ahụ, ha jiri ụdọ bronz kee ya agbụ, nye ya ọrụ ịnyagharị igwe na-akwọ ọka nʼụlọ mkpọrọ ha tinyere ya.

22Mgbe na-adịghị anya, agịrị isi ya malitekwara ito ọzọ.

23Ugbu a, ndịisi ndị Filistia niile zukọtara ịchụrụ chi ha bụ Dagọn, aja dị ukwuu, na ịṅụrị ọṅụ, na-asị, “Chi anyị enyela Samsin bụ onye iro anyị nʼaka anyị.”

24Mgbe ndị mmadụ hụrụ ya, ha toro chi ha sị, “Chi anyị enyela onye iro anyị nʼaka anyị, onye mere ka ala anyị tọgbọrọ nʼefu gbukwaa ọtụtụ ndị anyị.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.