Ndị Ikpe 16

Mgbe ndị mmadụ hụrụ ya, ha toro chi ha sị, “Chi anyị enyela onye iro anyị nʼaka anyị, onye mere ka ala anyị tọgbọrọ nʼefu gbukwaa ọtụtụ ndị anyị.”

Judges 16:24 (UKJV) And when the people saw him, they praised their god: for they said, Our god has delivered into our hands our enemy, and the destroyer of our country, which slew many of us.

22Mgbe na-adịghị anya, agịrị isi ya malitekwara ito ọzọ.

23Ugbu a, ndịisi ndị Filistia niile zukọtara ịchụrụ chi ha bụ Dagọn, aja dị ukwuu, na ịṅụrị ọṅụ, na-asị, “Chi anyị enyela Samsin bụ onye iro anyị nʼaka anyị.”

24Mgbe ndị mmadụ hụrụ ya, ha toro chi ha sị, “Chi anyị enyela onye iro anyị nʼaka anyị, onye mere ka ala anyị tọgbọrọ nʼefu gbukwaa ọtụtụ ndị anyị.”

25Mgbe ha ka nọ nʼobi ụtọ, ha tiri mkpu sị, “Dupụtara anyị Samsin, ka o kpaa anyị ọchị.” Ya mere, e dupụtara Samsin site nʼụlọ mkpọrọ ka o meere ha ihe egwuregwu. Ha mere ka o guzo nʼetiti ebe ogidi e ji wuo ụlọ ahụ dị.

26Mgbe ahụ, Samsin sịrị onye na-eji ya nʼaka sị, “Debe m nʼebe m ga-emetụ ogidi ndị ụlọ a na-eguzo na ha aka, ka m nwe ike dabere na ha.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.