5Ndị eze ndị Filistia, bịakwutere Delaịla rịọọ ya sị, “Gbalịa lee ma ị ga-enwe ike chọpụta ebe ike Samsin si abịa, ka anyị nwee ike ịmata ụzọ anyị ga-esi jide ya, kee ya agbụ. Ọ bụrụ na i meere anyị nke a, anyị na-ekwe nkwa na onye ọbụla nʼime anyị ga-enye gị puku shekel na narị shekel ọlaọcha.”
6Nʼihi nke a, Delaịla gwara Samsin okwu sị ya, “Gwa m ebe ike gị si abịa. Gwakwa m otu mmadụ pụrụ isi kee gị agbụ, merie gị.”
7Mgbe ahụ, Samsin zara sị ya, “Ọ bụrụ na mmadụ e jiri akwara eriri asaa dị ọhụrụ, ndị a na-amịkpọghị amịkpọ kee m, m ga-abụkwa onye na-adịghị ike dịka mmadụ ọbụla ọzọ.”
8Ngwangwa, ndịisi ndị Filistia wetara ya eriri asaa dị ọhụrụ ndị a na-amịbeghị nʼanwụ, o weere ha kee Samsin.
9Ma o mere ka ụfọdụ ndị ikom Filistia zoo onwe ha nʼotu akụkụ ụlọ ya. O tiri mkpu sị, “Samsin, lee, ndị Filistia abịala ijide gị!” Otu mgbe ahụ kwa, Samsin biliri dọbisie eriri ahụ dịka ọ bụ eriri e ji ogho mee nke bịara ọkụ nso. Ya mere, a chọpụtaghị ebe ike Samsin si abịa.