Ndị Ikpe 17

Ya mere, onye Livayị ahụ kwere nʼihe ọ gwara ya, nwokorobịa ahụ sooro ya biri ka otu nʼime ụmụ ya ndị ikom.

Judges 17:11 (UKJV) And the Levite was content to dwell with the man; and the young man was unto him as one of his sons.

9Maịka jụrụ ya, “Ebee ka i si bịa?” Ọ sịrị “Abụ m onye Livayị si Betlehem dị na Juda. Ana m achọrọ onwe m ebe m ga-anọ.”

10Mgbe ahụ, Maịka sịrị ya, “Soro biri nʼụlọ m, ghọkwara m nna na onye nchụaja, aga m akwụ gị mkpụrụ ego ọlaọcha shekel iri kwa afọ, nyekwa gị uwe, na ihe oriri.”

11Ya mere, onye Livayị ahụ kwere nʼihe ọ gwara ya, nwokorobịa ahụ sooro ya biri ka otu nʼime ụmụ ya ndị ikom.

12Mgbe ahụ, Maịka nyere onye Livayị ahụ ọrụ, nwokorobịa ahụ ghọọrọ ya onye nchụaja, birikwa nʼụlọ ya.

13Mgbe ahụ, Maịka kwuru, “Ugbu a, amaara m na Onyenwe anyị ga-agọzi m nke ukwuu, nʼihi na onye Livayị a aghọọla onye nchụaja m.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.