11Ya mere, onye Livayị ahụ kwere nʼihe ọ gwara ya, nwokorobịa ahụ sooro ya biri ka otu nʼime ụmụ ya ndị ikom.
12Mgbe ahụ, Maịka nyere onye Livayị ahụ ọrụ, nwokorobịa ahụ ghọọrọ ya onye nchụaja, birikwa nʼụlọ ya.
13Mgbe ahụ, Maịka kwuru, “Ugbu a, amaara m na Onyenwe anyị ga-agọzi m nke ukwuu, nʼihi na onye Livayị a aghọọla onye nchụaja m.”