2Otu ụbọchị, Maịka gwara nne ya okwu sị ya, “I chetara puku na narị ego ọlaọcha shekel ndị ahụ funarịrị gị, nke i ji nʼihi ya bụọ onye zuru ya ọnụ nʼoge gara aga? Eji m ọlaọcha ahụ. Ọ bụ m weere ya.” Nne ya sịrị, “Ka Onyenwe anyị gọzie gị nwa m!”
3Mgbe o nyeghachiri nne ya puku na narị ego ọlaọcha shekel ahụ, nne ya gwara ya sị, “Ana m edo ọlaọcha ndị a nsọ nye Onyenwe anyị nʼihi nwa m nwoke maka iji ya mee oyiyi a pịrị apị na arụsị a kpụrụ akpụ. Aga m emesịa nyeghachi gị ya.”
4Ya mere, o nyeghachiri nne ya ọlaọcha ahụ, Nne ya weere narị ego ọlaọcha shekel abụọ wegara ọkpụ ụzụ ọlaọcha, onye jiri ya mee oyiyi a pịrị apị na ihe a kpụrụ akpụ. E tinyere ha nʼụlọ Maịka.
5Nwoke ahụ bụ Maịka nwere ụlọ arụsị, o mere efọọd na arụsị ezinaụlọ dị iche iche, mee otu nʼime ụmụ ya ndị ikom ka ọ bụrụ onye nchụaja ya.
6Nʼụbọchị ndị a, Izrel enweghị eze na-achị ha. Nʼihi nke a, onye ọbụla na-eme ihe ọbụla ọ chọrọ, na ihe ọbụla dị ya mma nʼanya.