9Ha zara sị, “Bịanụ, ka anyị gaa buso ha agha. Anyị ahụla ala ahụ, ọ dịkwa mma nke ukwu. Gịnị ka unu na-agbara nkịtị? Unu egbula oge ịba nʼebe ahụ nweta ya.
10Mgbe unu ruru ebe ahụ, unu ga-ahụ ndị na-adịghị atụ anya ihe egwu ọbụla, na ala sara mbara nke Chineke na-etinye unu nʼaka. Ala nke ihe ọbụla na-adịghị akọ nʼime ya.”
11Ya mere, narị ndị agha isii ndị si nʼebo Dan biliri gaa ibuso obodo ahụ agha. Ha sikwa Zora na Eshtaol pụọ.
12Mgbe ha na-aga, ha rutere Kiriat Jearim, nke dị na Juda, maa ụlọ ikwu ha nʼebe ahụ. Ọ bụ ya mere e ji akpọ ebe ahụ dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ Kiriat Jearim Mahane Dan ruo taa.
13Emesịa, ha pụrụ nʼala ugwu ugwu Ifrem, bịarute nʼụlọ Maịka.