11Ya mere, narị ndị agha isii ndị si nʼebo Dan biliri gaa ibuso obodo ahụ agha. Ha sikwa Zora na Eshtaol pụọ.
12Mgbe ha na-aga, ha rutere Kiriat Jearim, nke dị na Juda, maa ụlọ ikwu ha nʼebe ahụ. Ọ bụ ya mere e ji akpọ ebe ahụ dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ Kiriat Jearim Mahane Dan ruo taa.
13Emesịa, ha pụrụ nʼala ugwu ugwu Ifrem, bịarute nʼụlọ Maịka.
14Mmadụ ise ndị ahụ gara nnyochapụta ala (ya bụ ala Laish) ahụ gwara ụmụnna ha sị, “Unu maara na nʼime otu ụlọ ndị a na e nwere efọọd, nʼụfọdụ arụsị ezinaụlọ ndị dị iche iche, na oyiyi a kpụrụ akpụ nke eji ọla wuo? Ugbu a, maranụ ihe unu ga-eme.”
15Ya mere, ha gara nʼebe ahụ, banye nʼụlọ nwokorobịa Livayị ahụ, ebe o bi nʼụlọ Maịka, jụọ ya maka ọdịmma ya.