Ndị Ikpe 18

Ya mere, ha gara nʼebe ahụ, banye nʼụlọ nwokorobịa Livayị ahụ, ebe o bi nʼụlọ Maịka, jụọ ya maka ọdịmma ya.

Judges 18:15 (UKJV) And they turned in that direction, and came to the house of the young man the Levite, even unto the house of Micah, and saluted him.

13Emesịa, ha pụrụ nʼala ugwu ugwu Ifrem, bịarute nʼụlọ Maịka.

14Mmadụ ise ndị ahụ gara nnyochapụta ala (ya bụ ala Laish) ahụ gwara ụmụnna ha sị, “Unu maara na nʼime otu ụlọ ndị a na e nwere efọọd, nʼụfọdụ arụsị ezinaụlọ ndị dị iche iche, na oyiyi a kpụrụ akpụ nke eji ọla wuo? Ugbu a, maranụ ihe unu ga-eme.”

15Ya mere, ha gara nʼebe ahụ, banye nʼụlọ nwokorobịa Livayị ahụ, ebe o bi nʼụlọ Maịka, jụọ ya maka ọdịmma ya.

16Narị ndị ikom Dan, ndị jikere ibu agha, guzo nʼọnụ ụzọ ama.

17Mgbe ahụ, ndị nnyocha ise ahụ banyere nʼime ụlọ ahụ buru arụsị ọla ahụ, na efọọd ahụ, na arụsị ezinaụlọ ndị ahụ, ma onye nchụaja ahụ na narị ndị agha isii ndị ji ngwa agha guzo nʼọnụ ụzọ ama.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.