Ndị Ikpe 18

Ndị ebo Dan nọgidere na-efe arụsị ndị ahụ Maịka mere oge ahụ niile ụlọ nzute Chineke dị na Shaịlo.

Judges 18:31 (UKJV) And they set them up Micah's graven image, which he made, all the time that the house of God was in Shiloh.

29Ọ bụ nke a mere e ji kpọọ aha obodo ahụ Dan, nke bụ aha nna ha ochie, onye bụ nwa Izrel. Ma tupu ebo Dan ebibie ya, aha obodo a nʼoge gara aga bụ Laish.

30Nʼebe ahụ ndị Dan guzobeere onwe ha arụsị, Jonatan, nwa Geshọm, nwa Mosis, na ụmụ ya ndị ikom niile ghọọrọ ndị nchụaja nye ebo Dan ruo nʼoge a dọtara ala ahụ nʼagha.

31Ndị ebo Dan nọgidere na-efe arụsị ndị ahụ Maịka mere oge ahụ niile ụlọ nzute Chineke dị na Shaịlo.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.