Ndị Ikpe 19

Ma iko ya nwanyị ahụ kwara iko megide ya. Ọ hapụrụ ya laghachi nʼezinaụlọ nne na nna ya na Betlehem, Juda. Ọ nọrọ ọnwa anọ nʼebe ahụ.

Judges 19:2 (UKJV) And his concubine played the whore against him, and went away from him unto her father's house to Bethlehemjudah, and was there four whole months.

1Nʼoge a, Izrel enweghị eze na-achị ha. Nʼoge ahụ kwa, ọ dị otu nwoke, onye Livayị bi nʼebe dị anya nʼala ugwu ugwu Ifrem. Nwoke a gara Betlehem, nʼime Juda, kpọrọ otu nwaagbọghọ ka ọ bụrụ iko ya nwanyị.

2Ma iko ya nwanyị ahụ kwara iko megide ya. Ọ hapụrụ ya laghachi nʼezinaụlọ nne na nna ya na Betlehem, Juda. Ọ nọrọ ọnwa anọ nʼebe ahụ.

3Nwoke ahụ kpebiri ịga nʼụlọ nna nwaagbọghọ ahụ ịrịọ ya ka ọ lọghachi. Ọ kpọọrọ otu nʼime ndị ohu ya, duru ịnyịnya ibu abụọ. Mgbe nwoke ahụ bịaruru nʼụlọ ahụ, iko ya nwanyị kpọbatara ya nʼụlọ nna ya. Mgbe nna nwaagbọghọ ahụ hụrụ ya, o jiri ọṅụ kelee ya ekele.

4Nna nwanyị ahụ rịọrọ ya ka ọ nọnyere ha ụfọdụ oge. Nʼihi nke a, ọ nọnyeere ha ụbọchị atọ. Ha niile nọrọ ọnọdụ obi ụtọ abalị atọ ahụ niile, rie ṅụọkwa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.