Ndị Ikpe 19

Nʼisi ụtụtụ, nwanyị ahụ biliri laghachi azụ nʼụlọ ahụ iko ya nwoke nọ. Ma ọ dara nʼala nʼihu ọnụ ụzọ ụlọ ahụ tọgbọrọ nʼebe ahụ tutu chi abọzie.

Judges 19:26 (UKJV) Then came the woman in the dawning of the day, and fell down at the door of the man's house where her lord was, till it was light.

24Ka m kpọpụtara unu nwa m nwanyị na-amaghị nwoke, na iko nwanyị nwoke a ka unu jiri ha mee ihe ọbụla unu chọrọ ma hapụnụ nwoke a. Unu emela ihe ihere dị otu a.”

25Ma ndị ikom ahụ egeghị ya ntị. Ya mere, nwoke ahụ kpọpụtara iko ya nwanyị zipụrụ ha ya nʼezi. Ha niile nʼotu na otu, dinakwuru nwanyị ahụ abalị ahụ niile. Mgbe chi na-achọ ịbọ, ha hapụrụ ya ka ọ laa.

26Nʼisi ụtụtụ, nwanyị ahụ biliri laghachi azụ nʼụlọ ahụ iko ya nwoke nọ. Ma ọ dara nʼala nʼihu ọnụ ụzọ ụlọ ahụ tọgbọrọ nʼebe ahụ tutu chi abọzie.

27Mgbe nwoke ahụ biliri nʼụtụtụ, meghee ụzọ ka ọ malite ije ya, ọ hụrụ iko ya nwanyị ahụ ka ọ tọgbọ nʼọnụ ụzọ ahụ. Aka ya abụọ dịkwa nʼọnụ ụzọ mbata ụlọ ahụ.

28Nwoke ahụ kpọkuru ya sị ya, “Ngwa, bilie ka anyị laa.” Ma nwaagbọghọ ahụ ekwughị okwu ọbụla. Nwoke ahụ buliri ya, tụkwasị ya nʼelu ịnyịnya ibu ya, buru ya laa nʼobodo nke aka ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.