23Agadi nwoke ahụ bụ onyenwe ụlọ ahụ pụkwuuru ha nʼezi, sị ha, “Biko ụmụnna m, unu emela ihe ọjọọ dị otu a. Nwoke a nọ nʼụlọ m dịka ọbịa. Unu emela ihe ihere dị otu a.
24Ka m kpọpụtara unu nwa m nwanyị na-amaghị nwoke, na iko nwanyị nwoke a ka unu jiri ha mee ihe ọbụla unu chọrọ ma hapụnụ nwoke a. Unu emela ihe ihere dị otu a.”
25Ma ndị ikom ahụ egeghị ya ntị. Ya mere, nwoke ahụ kpọpụtara iko ya nwanyị zipụrụ ha ya nʼezi. Ha niile nʼotu na otu, dinakwuru nwanyị ahụ abalị ahụ niile. Mgbe chi na-achọ ịbọ, ha hapụrụ ya ka ọ laa.
26Nʼisi ụtụtụ, nwanyị ahụ biliri laghachi azụ nʼụlọ ahụ iko ya nwoke nọ. Ma ọ dara nʼala nʼihu ọnụ ụzọ ụlọ ahụ tọgbọrọ nʼebe ahụ tutu chi abọzie.
27Mgbe nwoke ahụ biliri nʼụtụtụ, meghee ụzọ ka ọ malite ije ya, ọ hụrụ iko ya nwanyị ahụ ka ọ tọgbọ nʼọnụ ụzọ ahụ. Aka ya abụọ dịkwa nʼọnụ ụzọ mbata ụlọ ahụ.