Ndị Ikpe 19

Nʼụbọchị nke anọ, nwoke ahụ na iko ya jikeere nʼisi ụtụtụ ịlaghachi. Ma nna nwanyị ahụ rịọrọ ha sị ha, “Jirinụ ihe oriri gbaanụ onwe unu ume. Emesịa unu nwere ike ịlawa.”

Judges 19:5 (UKJV) And it came to pass on the fourth day, when they arose early in the morning, that he rose up to depart: and the damsel's father said unto his son in law, Comfort yours heart with a morsel of bread, and afterward go your way.

3Nwoke ahụ kpebiri ịga nʼụlọ nna nwaagbọghọ ahụ ịrịọ ya ka ọ lọghachi. Ọ kpọọrọ otu nʼime ndị ohu ya, duru ịnyịnya ibu abụọ. Mgbe nwoke ahụ bịaruru nʼụlọ ahụ, iko ya nwanyị kpọbatara ya nʼụlọ nna ya. Mgbe nna nwaagbọghọ ahụ hụrụ ya, o jiri ọṅụ kelee ya ekele.

4Nna nwanyị ahụ rịọrọ ya ka ọ nọnyere ha ụfọdụ oge. Nʼihi nke a, ọ nọnyeere ha ụbọchị atọ. Ha niile nọrọ ọnọdụ obi ụtọ abalị atọ ahụ niile, rie ṅụọkwa.

5Nʼụbọchị nke anọ, nwoke ahụ na iko ya jikeere nʼisi ụtụtụ ịlaghachi. Ma nna nwanyị ahụ rịọrọ ha sị ha, “Jirinụ ihe oriri gbaanụ onwe unu ume. Emesịa unu nwere ike ịlawa.”

6Ya mere, ha abụọ nọdụrụ ala rie ihe, ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ. Mgbe e mesiri, nna nwaagbọghọ ahụ sịrị ha, “Biko, nọdụnụ rahụ ụra nʼabalị taa, meekwanụ onwe unu obi ụtọ.”

7Ma mgbe nwoke ahụ biliri ka ọ laa, nna nwaagbọghọ ahụ, nọgidere ya, nke a mere ka o kwenye ịnọ ruo echi ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.