Ndị Ikpe 2

Mgbe ahụ, ndị Izrel mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị site nʼife Baal ofufe.

Judges 2:11 (UKJV) And the children of Israel did evil in the sight of the LORD, and served Baalim:

9E liri ya nʼoke ala nke ihe nketa ya, nʼobodo Timnat Heres, nʼala ugwu ugwu nke ebo Ifrem, nʼụzọ mgbago ugwu Gaash.

10Emesịa, ọgbọ ahụ niile nwụrụ dịka ndị nna nna ha, ọgbọ ọzọ tolitere, ndị na-amaghị Onyenwe anyị maọbụ ihe ndị nke o mere nye ụmụ Izrel.

11Mgbe ahụ, ndị Izrel mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị site nʼife Baal ofufe.

12Ha gbakụtara Onyenwe anyị azụ, bụ Chineke ahụ, nna ha fere ofufe, onye kpọpụtara ha site nʼala Ijipt. Ma ha malitere ife na ịsọpụrụ, na ịkpọ isiala nye ọtụtụ chi dị iche iche, bụ chi nke ndị bi ha gburugburu. Ha si otu a kpasuo Onyenwe anyị iwe.

13Ha gbakụtara Onyenwe anyị azụ, fee chi Baal na Ashtọret ofufe.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.