Ndị Ikpe 2

Ha gbakụtara Onyenwe anyị azụ, fee chi Baal na Ashtọret ofufe.

Judges 2:13 (UKJV) And they forsook the LORD, and served Baal and Ashtaroth.

11Mgbe ahụ, ndị Izrel mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị site nʼife Baal ofufe.

12Ha gbakụtara Onyenwe anyị azụ, bụ Chineke ahụ, nna ha fere ofufe, onye kpọpụtara ha site nʼala Ijipt. Ma ha malitere ife na ịsọpụrụ, na ịkpọ isiala nye ọtụtụ chi dị iche iche, bụ chi nke ndị bi ha gburugburu. Ha si otu a kpasuo Onyenwe anyị iwe.

13Ha gbakụtara Onyenwe anyị azụ, fee chi Baal na Ashtọret ofufe.

14Ya mere, Onyenwe anyị were iwe megide Izrel, rara ha nye nʼaka ndị ji aka ike pụnara ha ihe ha nwere. O weere ha resi ndị iro ha gbara ha gburugburu, bụ ndị ha enwekwaghị ike iguzogide.

15Dịka ọ ṅụrụ ya nʼiyi nye ha, mgbe ọbụla ụmụ Izrel pụrụ ibu agha, aka Onyenwe anyị megidere ha ime ka ha bụrụ ndị e meriri emeri. Ọnọdụ ha jọrọ njọ nke ukwuu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.