18Ma mgbe ọbụla Onyenwe anyị nyere ụmụ Izrel onye ikpe, ọ na-anọnyere onye ikpe ahụ ogologo ụbọchị niile nke ndụ ya. Ọ na-esitekwa nʼaka onye ikpe a napụta ụmụ Izrel nʼaka ndị iro ha nʼihi na Onyenwe anyị nwere obi ebere nʼahụ ụmụ Izrel, mgbe ha na-asụ ude, nʼihi mmegbu na mkpagbu niile ndị iro ha na-emegbu ha, ma na-akpagbukwa ha.
19Ma mgbe ọbụla onye ikpe a nwụrụ, ụmụ Izrel na-alaghachi azụ biwe ndụ ọjọọ karịa nke nna nna ha ochie. Ha na-agbaso chi ndị ọzọ, na-akpọ isiala nye ha, na ife ha ofufe. Ha jụrụ iwezuga agwa ọjọọ ha ndị a ma ọ bụkwa ụzụ isiike ha.
20Nʼihi nke a, Onyenwe anyị were iwe dị ọkụ megide Izrel, ma sị, “Nʼihi na mba a emebiela ọgbụgba ndụ ahụ m nyere nna ha nʼiwu, jụkwa ige m ntị,
21agaghị m achụpụkwa site nʼihu ha mba ndị ahụ Joshua hapụrụ mgbe ọ nwụrụ.
22Aga m eji ha nwalee Izrel, ịchọpụta ma ha ga-elezi anya idebe ụzọ Onyenwe anyị, gaakwa ije nʼime ya dịka nna nna ha mere m.”