20Nʼihi nke a, Onyenwe anyị were iwe dị ọkụ megide Izrel, ma sị, “Nʼihi na mba a emebiela ọgbụgba ndụ ahụ m nyere nna ha nʼiwu, jụkwa ige m ntị,
21agaghị m achụpụkwa site nʼihu ha mba ndị ahụ Joshua hapụrụ mgbe ọ nwụrụ.
22Aga m eji ha nwalee Izrel, ịchọpụta ma ha ga-elezi anya idebe ụzọ Onyenwe anyị, gaakwa ije nʼime ya dịka nna nna ha mere m.”
23Onyenwe anyị hapụrụ mba ndị ahụ niile ka ha nọgide. Ọ chụpụghị ha ngwangwa site na inyefe ha nʼaka Joshua.