Ndị Ikpe 2

Agwara m unu, na ‘agaghị m esite nʼihu unu chụpụ ha; ha ga-adịrị unu dịka ọnya nʼakụkụ niile, ebe chi niile ha ga-abụkwara unu ihe na-eweta ọnwụnwa.’ ”

Judges 2:3 (UKJV) Wherefore I also said, I will not drive them out from before you; but they shall be as thorns in your sides, and their gods shall be a snare unto you.

1Mmụọ ozi Onyenwe anyị sitere na Gilgal bịa Bokim gwa ndị Izrel okwu sị ha, “Mụ onwe m kpọpụtara unu site nʼIjipt, kpọbata unu nʼala a dịka m kwere nna unu ha na nkwa. Asịrị m, ‘Agaghị m ala azụ imezu ọgbụgba ndụ mụ na unu,

2unu na ndị bi nʼobodo ahụ agbakwala ndụ ọbụla, kama unu ga-etitu ebe ịchụ aja ha.’ Ma unu erubeghị isi nʼokwu a, gịnị mere unu emeghị nke a?

3Agwara m unu, na ‘agaghị m esite nʼihu unu chụpụ ha; ha ga-adịrị unu dịka ọnya nʼakụkụ niile, ebe chi niile ha ga-abụkwara unu ihe na-eweta ọnwụnwa.’ ”

4Mgbe Mmụọ ozi Onyenwe anyị ahụ kwusiri okwu ndị a, ụmụ Izrel niile kwara akwa nke ukwuu.

5Nʼihi nke a, ha kpọrọ ebe ahụ Bokim. Ha chụụrụ Onyenwe anyị aja nʼebe ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.