Ndị Ikpe 2

Mgbe Joshua zilagasịrị ndị Izrel niile, onye ọbụla nʼime ha gara nʼihe nketa ya, inweta ya, dịka ebo ọbụla dị nʼIzrel si dị.

Judges 2:6 (UKJV) And when Joshua had let the people go, the children of Israel went every man unto his inheritance to possess the land.

4Mgbe Mmụọ ozi Onyenwe anyị ahụ kwusiri okwu ndị a, ụmụ Izrel niile kwara akwa nke ukwuu.

5Nʼihi nke a, ha kpọrọ ebe ahụ Bokim. Ha chụụrụ Onyenwe anyị aja nʼebe ahụ.

6Mgbe Joshua zilagasịrị ndị Izrel niile, onye ọbụla nʼime ha gara nʼihe nketa ya, inweta ya, dịka ebo ọbụla dị nʼIzrel si dị.

7Ndị Izrel fere Onyenwe anyị ofufe ụbọchị niile nke ndụ Joshua, na nke ndụ ndị okenye ahụ, bụ ndị gara nʼihu bie ndụ mgbe ọ nwụsịrị, bụkwa ndị hụrụ ọrụ ukwuu niile nke Onyenwe anyị rụụrụ ndị Izrel.

8Ma Joshua, nwa Nun, onyeozi Onyenwe anyị nwụrụ, mgbe ọ gbara otu narị afọ, na afọ iri.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.