1Mgbe ahụ, ndị Izrel niile ndị si nʼala Dan ruo Bịasheba, tinyere ndị si nʼala Gilead, pụtara dịka otu mmadụ, bịa zukọọ nʼihu Onyenwe anyị na Mizpa.
2Ndị ndu ebo Izrel niile weere ọnọdụ na nzukọ nke ndị Chineke, ọnụọgụgụ ha bụ narị puku ndị agha anọ, ndị na-ebu mma agha.
3Mgbe na-adịghị anya, nzukọ ụmụ Izrel niile na Mizpa ruru ụmụ Benjamin ntị. Mgbe ahụ, ndịisi Izrel niile kpọrọ nwoke ahụ e gburu iko ya nwanyị sị ya, “Kọọrọ anyị otu ihe ọjọọ a si mee.”
4Ya mere, onye Livayị ahụ, di nwanyị ahụ e gburu kwuru sị, “Mụ na iko m nwanyị bịaruru obodo Gibea, obodo nta ndị Benjamin, kwụsị nʼebe ahụ ịnọ ọnọdụ abalị.