Ndị Ikpe 20

Nʼoge a kwa, ndị agha Benjamin si nʼobodo Gibea pụta ibuso ha agha. Ha gburu ndị agha Izrel ọnụọgụgụ ha dị puku iri na asatọ. Ndị a niile bụkwa ndị ji mma agha ebu agha.

Judges 20:25 (UKJV) And Benjamin went forth against them out of Gibeah the second day, and destroyed down to the ground of the children of Israel again eighteen thousand men; all these drew the sword.

23Ndị agha Izrel kwara akwa nke ukwuu nʼụbọchị ahụ nʼihu Onyenwe anyị site nʼụtụtụ ruo anyasị. Ha jụrụ Onyenwe anyị ase ọzọ sị ya, “Anyị ga-aga nʼihu ịlụso ụmụnna anyị ndị Benjamin ọgụ?” Onyenwe anyị zara sị ha, “Gaanụ ga lụso ha agha.”

24Nʼihi nke a, ndị Izrel jeghachikwara ọzọ ibuso ụmụ Benjamin agha nʼụbọchị nke abụọ ya.

25Nʼoge a kwa, ndị agha Benjamin si nʼobodo Gibea pụta ibuso ha agha. Ha gburu ndị agha Izrel ọnụọgụgụ ha dị puku iri na asatọ. Ndị a niile bụkwa ndị ji mma agha ebu agha.

26Mgbe ahụ, ndị Izrel niile gara Betel, nọdụ nʼebe ahụ, kwaa akwa nʼihu Onyenwe anyị Ha erighị nri ọbụla nʼụbọchị ahụ site nʼụtụtụ ruo nʼanyasị. Ha chere nʼihu Onyenwe anyị onyinye aja udo, ma chụọkwa aja nsure ọkụ.

27Ndị Izrel jụrụ ase site nʼaka Onyenwe anyị. (Nʼoge ndị ahụ, igbe ọgbụgba ndụ Chineke dị nʼebe ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.