Ndị Ikpe 20

Mgbe ahụ, ndị Izrel niile gara Betel, nọdụ nʼebe ahụ, kwaa akwa nʼihu Onyenwe anyị Ha erighị nri ọbụla nʼụbọchị ahụ site nʼụtụtụ ruo nʼanyasị. Ha chere nʼihu Onyenwe anyị onyinye aja udo, ma chụọkwa aja nsure ọkụ.

Judges 20:26 (UKJV) Then all the children of Israel, and all the people, went up, and came unto the house of God, and wept, and sat there before the LORD, and fasted that day until even, and offered burnt offerings and peace offerings before the LORD.

24Nʼihi nke a, ndị Izrel jeghachikwara ọzọ ibuso ụmụ Benjamin agha nʼụbọchị nke abụọ ya.

25Nʼoge a kwa, ndị agha Benjamin si nʼobodo Gibea pụta ibuso ha agha. Ha gburu ndị agha Izrel ọnụọgụgụ ha dị puku iri na asatọ. Ndị a niile bụkwa ndị ji mma agha ebu agha.

26Mgbe ahụ, ndị Izrel niile gara Betel, nọdụ nʼebe ahụ, kwaa akwa nʼihu Onyenwe anyị Ha erighị nri ọbụla nʼụbọchị ahụ site nʼụtụtụ ruo nʼanyasị. Ha chere nʼihu Onyenwe anyị onyinye aja udo, ma chụọkwa aja nsure ọkụ.

27Ndị Izrel jụrụ ase site nʼaka Onyenwe anyị. (Nʼoge ndị ahụ, igbe ọgbụgba ndụ Chineke dị nʼebe ahụ.

28Finehaz nwa Elieza, nwa nwa Erọn na-eje ozi nchụaja nʼebe ahụ.) Ụmụ Izrel jụrụ Onyenwe anyị ase sị ya, “Ọ bụ anyị gaakwa ọzọ ibuso ụmụnna anyị ndị Benjamin agha, ka ị sị anyị agala?” Onyenwe anyị zara sị ha, “Gaanụ, nʼihi na aga m ahụ na unu meriri ndị agha Benjamin echi.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.