Ndị Ikpe 20

Ndị Izrel na ndị zoro nʼọhịa kwekọtara na ha ga-eme ka anwụrụ ọkụ dị ukwuu na-ala elu elu site nʼobodo ahụ,

Judges 20:38 (UKJV) Now there was an appointed sign between the men of Israel and the hidden attackers in wait, that they should make a great flame with smoke rise up out of the city.

36Mgbe ahụ, ndị Benjamin nʼonwe ha, hụrụ na e emeriela ha. Ugbu a, ndị ikom Izrel nyere ndị Benjamin ohere ịga nʼihu, nʼihi na ha dabere na ndị ha zoro nʼọhịa nʼakụkụ Gibea.

37Ndị ahụ zoro nʼọhịa gbapụtara ọsịịsọ gbaba nʼobodo Gibea, kesaa onwe ha, were mma agha gbuchapụ ndị niile nọ nʼobodo ahụ.

38Ndị Izrel na ndị zoro nʼọhịa kwekọtara na ha ga-eme ka anwụrụ ọkụ dị ukwuu na-ala elu elu site nʼobodo ahụ,

39ma mgbe ahụ, ndị Izrel ga-ebido ịbọ ọbọ ogbugbu egburu ha. Ndị Benjamin egbuolarị iri ndị Izrel atọ, nʼihi ya ha sịrị, “Anyị na-emeri ha dịka anyị mere nʼagha mbụ.”

40Ma mgbe anwụrụ ọkụ malitere ịla elu site nʼobodo ahụ, ndị Benjamin lere anya nʼazụ hụ ka anwụrụ ọkụ na-ala elu site nʼakụkụ niile nke obodo ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.