Ndị Ikpe 20

Nʼihi ya, abọwasịrị m ahụ iko m nwanyị ụzọ iri na abụọ, zisa ya nʼakụkụ niile nke ihe nketa ndị Izrel niile nʼihi na ndị ikom Gibea ndị ahụ emeela ihe ọjọọ na ihe ihere nʼala Izrel.

Judges 20:6 (UKJV) And I took my concubine, and cut her in pieces, and sent her throughout all the country of the inheritance of Israel: for they have committed lewdness and folly in Israel.

4Ya mere, onye Livayị ahụ, di nwanyị ahụ e gburu kwuru sị, “Mụ na iko m nwanyị bịaruru obodo Gibea, obodo nta ndị Benjamin, kwụsị nʼebe ahụ ịnọ ọnọdụ abalị.

5Nʼoge abalị, ndị ikom Gibea bịara gba ụlọ anyị nọ nʼime ya gburugburu. Nzube ha bụ igbu m. Ma ha jidere iko m nwanyị, dinakwuru ya nʼike, tutu ruo mgbe ọ nwụrụ.

6Nʼihi ya, abọwasịrị m ahụ iko m nwanyị ụzọ iri na abụọ, zisa ya nʼakụkụ niile nke ihe nketa ndị Izrel niile nʼihi na ndị ikom Gibea ndị ahụ emeela ihe ọjọọ na ihe ihere nʼala Izrel.

7Ugbu a, unu ụmụ Izrel niile, unu onwe unu tụleenụ okwu a, nyekwanụ ndụmọdụ ihe a ga-eme ebe a.”

8Ndị mmadụ niile kulitere dịka otu onye, sị, “O nweghị onye ọbụla ga-ala na be ya. O nweghị onye ọbụla ga-esi nʼebe a laa nʼụlọ ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.