Ndị Ikpe 21

Nʼisi ụtụtụ echi ya, ha biliri ngwangwa rụọ ebe ịchụ aja. Ha chụrụ aja nsure ọkụ, na aja udo nʼebe ahụ.

Judges 21:4 (UKJV) And it came to pass on the next day, that the people rose early, and built there an altar, and offered burnt offerings and peace offerings.

2Ndị Izrel niile gara Betel, nọdụ ebe ahụ ruo mgbede nʼihu Chineke. Ha welitere olu bee akwa dara ụda.

3“Ha sịrị, Onyenwe anyị, Chineke Izrel, gịnị mere ihe dị otu a ji dakwasị Izrel? Gịnị mere a ga-eji na-achọ otu ebo Izrel achọ taa?”

4Nʼisi ụtụtụ echi ya, ha biliri ngwangwa rụọ ebe ịchụ aja. Ha chụrụ aja nsure ọkụ, na aja udo nʼebe ahụ.

5Emesịa, ha jụrịtara onwe ha ajụjụ sị, “O nwere ebo Izrel na-enweghị onye nọchiri anya ha nʼihu Onyenwe anyị anyị mgbe anyị zukọrọ na Mizpa?” Nʼihi na ha ṅụrụ iyi kwuo na onye ọbụla jụrụ ịbịa nʼihu Onyenwe anyị na Mizpa aghaghị ịnwụ.

6Ma oke iru ụjụ dị nʼala Izrel dum nʼihi ihe dakwasịrị ụmụnna ha, bụ ndị Benjamin. Ha niile kwuru sị, “Taa, otu ebo Izrel alaala nʼiyi, e kpochapụla ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.